Job 31

1“Mụ na anya m gbara ndụ kpebie
na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.
Maọbụ, anya ọjọọ Mat 5:28

2Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu;
gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?
3Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume,
nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?
4Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile,
gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?

5“Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha
maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,
6ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m,
ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.
7Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya,
ọ bụrụ anya m na-edu obi m,
ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,
8ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi,
ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.

9“Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ,
maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m,
10mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri,
ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.
11Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere,
bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.
12Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi;
Maọbụ, Mbibi

nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile.

13“Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi
nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi
mgbe ha nwere mkpesa megide m,
14gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m?
Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ?
15Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha?
Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?

16“Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa,
ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi,
17ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m,
ma jụ inye ya ụmụ mgbei;
18ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri,
ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ.
19Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa,
maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,
20ma obi ha agọzighị m
nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.
21Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ,
nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,
22mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ,
ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.
23Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke,
nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.

24“Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo,
maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’
25Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m,
ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru,
26ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya,
maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya,
27nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo,
maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe,
28mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe,
nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.

29“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m
maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,
30ekwebeghị m ka ọnụ m mehie
megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.
31Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị.
‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’
32Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama,
nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije.
33Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,
Maọbụ, dịka Adam mere

site nʼizobe mmehie m nʼime obi m,
34nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ,
si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche,
nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.

35(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị!
Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m,
ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.
36Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m,
aga m eyinyekwa ya dịka okpueze.
37Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile,
aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)

38“Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m,
ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri,
39ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ,
maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba,
40ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti,
ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.”
Okwu Job agwụla.

Copyright information for IboBIU